8 “Ana m asị unu, onye ọ bụla nke na-agwa ndị mmadụ na ya ma m,+ Nwa nke mmadụ ga-agwakwa ndị mmụọ ozi Chineke na ọ ma onye ahụ.+9 Ma, onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, m ga-agọnahụ ya n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke.+
5 Onye meriri n’agha+ ga-esi otú ahụ yiri uwe na-acha ọcha.+ M gaghịkwa ehichapụ aha ya n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwu n’ihu Nna m na n’ihu ndị mmụọ ozi ya na m ma aha ya.+