16 Ihe a emeela ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuo, sị:
“Ana m adọnye otu nkume na Zayọn ka ọ bụrụ ntọala. Nkume a anaghị agharịpụ agharịpụ.+
Ọ bụ nkume dị oké ọnụ+ nke ga-eme ka ntọala ụlọ sie ezigbo ike.+
Ụjọ agaghịkwa atụ onye nwere okwukwe na ya.+