-
Matiu 8:30-33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
30 Ma ìgwè ézì nọ na-ata ahịhịa n’ebe dị anya n’ebe ha nọ.+ 31 Ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee malite ịrịọ ya, sị: “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, hapụ anyị ka anyị banye n’ime ìgwè ézì ndị ahụ.”+ 32 O wee sị ha: “Banyenụ!” Ha wee pụta banye n’ime ézì ndị ahụ. Ìgwè ézì ahụ niile nuuru daba n’oké osimiri ma nwụọ n’ime mmiri. 33 Ma ndị na-azụ ézì ndị ahụ gbara ọsọ. Mgbe ha banyere n’obodo, ha kọrọ ihe niile mere, kọọkwa gbasara ndị ahụ mmụọ ọjọọ ji.
-
-
Luk 8:32-34Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
32 Ma, e nwere ìgwè ézì+ ndị nọ n’ugwu dị ebe ahụ na-ata ahịhịa. N’ihi ya, ha rịọrọ ya ka o kwe ka ha banye n’ime ézì ndị ahụ. O wee kwe ha.+ 33 Mmụọ ọjọọ ndị ahụ wee si n’ime nwoke ahụ pụọ banye n’ime ézì ndị ahụ. Ìgwè ézì ahụ nuuru daba n’ọdọ mmiri, mmiri erie ha. 34 Ma mgbe ndị na-azụ ézì ndị ahụ hụrụ ihe merenụ, ha gbaara ọsọ gaa n’obodo ha nakwa gburugburu ya kọọ ihe merenụ.
-