-
Matiu 9:20-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Ma, otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ+ bịara ya n’azụ wee bitụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka,+ 21 n’ihi na ọ nọ na-agwa onwe ya, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.” 22 Jizọs tụgharịrị, hụ ya wee sị: “Obi sie gị ike, nwa m nwaanyị. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+ Malite n’oge ahụ, nwaanyị ahụ gbakere.+
-