42 Ozugbo ahụ, a gwọrọ ya ekpenta ya, ya adị ọcha. 43 Tupu nwoke ahụ alawa, Jizọs dọsiri ya aka ná ntị ike, 44 sị ya: “Ya enwekwala onye ị ga-akọrọ ihe ọ bụla. Kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị, nyekwa ihe ndị Mosis kwuru na onye ekpenta ga-enye ma ọ dị ọcha,+ ka e wee mara na a gwọọla gị.”+