-
Matiu 14:6-12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ma mgbe a na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ Herọd,+ ada Herodias gbara egwú n’ememme ahụ, wee mee Herọd ezigbo obi ụtọ+ 7 nke na ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ. 8 Nwa agbọghọ ahụ kwuziri ihe mama ya sị ya kwuo. Ọ sịrị: “Bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim n’efere mbadamba.”+ 9 Ọ bụ eziokwu na ihe a ọ rịọrọ wutere eze, o nyere iwu ka e bunye ya isi Jọn, n’ihi iyi ahụ ọ ṅụrụ n’ihu ndị ha na ya nọ na-eri ihe. 10 O wee ziga ndị gara n’ụlọ mkpọrọ gbupụ Jọn isi. 11 E butere isi ya n’efere mbadamba bunye nwa agbọghọ ahụ, o wee butere ya nne ya. 12 E mechaa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara buru ozu ya gaa lie, bịakwa kọọrọ Jizọs.
-