-
Jenesis 40:20-22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Ụbọchị nke atọ ahụ bụ ụbọchị Fero na-echeta ụbọchị a mụrụ ya.+ O wee meere ndị niile na-ejere ya ozi oriri. Ọ kpọpụtara onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya na onyeisi ndị na-emere ya achịcha n’ihu ndị na-ejere ya ozi. 21 Fero nyeghachiri onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya ọrụ ọ na-arụbu, ya ebunyewekwa ya mmanya. 22 Ma ọ kwụwara onyeisi ndị na-emere ya achịcha n’osisi, otú Josef kwuru mgbe ọ na-akọwara ha nrọ.+
-