-
Matiu 14:15-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ma mgbe o ruru uhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya wee sị: “Ebe a dịpụrụ adịpụ, chi ejiwekwala. Gwa ìgwè mmadụ a ka ha lawa gaa n’obodo ndị dị nso zụrụ nri ha ga-eri.”+ 16 Ma, Jizọs sịrị ha: “Ha ekwesịghị ịla. Nyenụ ha nri ka ha rie.” 17 Ha asị ya: “Ọ dịghị ihe anyị nwere ebe a, ma e wezụga ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ.” 18 Ya asị ha: “Wetaranụ m ha ebe a.” 19 O wee gwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala n’ahịhịa. Ya ewerezie ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe kpee ekpere.*+ Mgbe ọ nyawachara achịcha ndị ahụ, o nyere ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya enyewezie ha ìgwè mmadụ ahụ. 20 Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.+ 21 Ma ndị riri ya dị ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise (5,000), ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị.+
-
-
Luk 9:12-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Mgbe chi jiwere, ndịozi ya iri na abụọ bịara sị ya: “Gwa ìgwè mmadụ a ka ha lawa, ka ha gaa n’ime obodo nakwa n’obodo nta ndị dị gburugburu ebe a chọta ebe ha ga-ehi na ihe ha ga-eri, n’ihi na ndị mmadụ anaghị anọkarị ebe a anyị nọ.”+ 13 Ma ọ sịrị ha: “Nyenụ ha nri ka ha rie.”+ Ha asị: “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ka anyị nwere. Oleekwa otú anyị ga-esi azụta ihe mmadụ niile a ga-eri?” 14 N’eziokwu, ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise nọ ebe ahụ. Ma ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Hazienụ ha n’ìgwè n’ìgwè, ka ha nọdụkwa ala, ihe dị ka mmadụ iri ise mmadụ iri ise.” 15 Ha wee hazie ha otú ahụ, ha niile anọdụkwa ala. 16 O wee were ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe kpee ekpere.* O wee nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha nye ìgwè mmadụ ahụ. 17 Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.+
-