-
2 Ndị Eze 4:42-44Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
42 Otu nwoke mechara si Bel-shalisha+ bịa. O buteere onye nke ezi Chineke ogbe achịcha iri abụọ e ji ọka bali mee.+ Ọka bali a si ná mkpụrụ mbụ kara aka. O butekwaara ya otu akpa ọka bali ọhụrụ.+ Ịlaịsha asị ya: “Bunye ya ndị a ka ha rie.” 43 Ma, onye na-ejere ya ozi sịrị: “Ọ̀ bụ obere ihe a ka m ga-ebunye otu narị (100) ụmụ nwoke?”+ Ya asị ya: “Bunye ha ya ka ha rie, n’ihi na Jehova kwuru, sị, ‘Ha ga-eri ya rijuo afọ, ya afọkwa.’”+ 44 O bupụtaziiri ha ya, ha erie, rijuo afọ, ya afọkwa+ otú Jehova kwuru.
-
-
Jọn 6:7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Filip zara ya, sị: “E jirigodị narị mkpụrụ ego dinarịọs abụọ (200) zụta achịcha, ọ gaghị ezu onye ọ bụla n’ime ha inweta ntakịrị.”
-