-
Matiu 21:33-41Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
33 “Nụrụnụ ihe atụ ọzọ: E nwere otu nwoke nwere ala, kọọ ubi vaịn na ya,+ gbaakwa ya ogige ma gwuo ebe a na-azọchapụta mmanya na ya, rụọkwa ụlọ elu na ya.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gaa mba ọzọ.+ 34 Mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o ziri ndị ohu ya ka ha gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ weta mkpụrụ ya. 35 Ma, ndị ọrụ ubi ahụ jidere ndị ohu ya, tikasịa otu ahụ́, gbuo onye nke ọzọ, tụọkwa onye nke ọzọ nkume.+ 36 O zikwara ndị ohu ọzọ, ndị dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ, ka ha gakwuru ha. Ma, ha mere ha otu ihe ahụ.+ 37 N’ikpeazụ, o zigaara ha ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’ 38 Mgbe ndị ọrụ ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a.+ Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’ 39 Ha wee jide ya, kpọpụ ya n’ubi vaịn ahụ, gbuo ya.+ 40 N’ihi ya, mgbe onye nwe ubi vaịn ahụ bịara, gịnị ka ọ ga-eme ndị ọrụ ubi ahụ?” 41 Ha asị ya: “Ebe ọ bụ na ha bụ ndị ọjọọ, ọ ga-abịa laa ha n’iyi, nyefeekwa ubi vaịn ahụ n’aka ndị ọrụ ubi ọzọ, ndị ga-enye ya mkpụrụ ya mgbe oge ya ruru.”
-
-
Luk 20:9-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 O wee malite imere ìgwè mmadụ ahụ ihe atụ, sị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn+ ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi, gaakwa mba ọzọ, nọtee aka.+ 10 Ma mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o zipụrụ otu ohu ya ka ọ gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ ka ha nye ya ụfọdụ n’ime mkpụrụ si n’ubi vaịn ahụ. Ma, ndị ọrụ ubi ahụ tikasịchara ya ahụ́, chụlaa ya n’enyeghị ya ihe ọ bụla.+ 11 Ma o zigakwaara ha ohu ọzọ. Ha tikwara onye nke ahụ ihe ma menye ya ihere, chụlaa ya n’enyeghị ya ihe ọ bụla. 12 O zigakwara onye nke atọ. Ha merụkwara ya ahụ́ ma chụlaa ya. 13 Onye nwe ubi vaịn ahụ wee sị, ‘Gịnị ka m ga-eme? M ga-eziga ọkpara m m hụrụ n’anya.+ Ikekwe, ha ga-akwanyere yanwa ùgwù.’ 14 Mgbe ndị ọrụ ubi ahụ hụrụ ya, ha gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a. Ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’ 15 Ha wee kpọpụ ya n’ubi vaịn ahụ, gbuo ya.+ Gịnịzi ka onye nwe ubi vaịn ahụ ga-eme ha? 16 Ọ ga-abịa gbuo ndị ọrụ ubi a ma nyefee ndị ọzọ ubi vaịn ahụ.”
Mgbe ha nụrụ ihe a, ha sịrị: “Tụfịakwa!”
-