-
Luk 20:34-36Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 Jizọs asị ha: “Ụmụ nke oge a* na-alụ nwunye, a na-ekekwa ha di. 35 Ma, ndị e weere ka ndị ruru eru ịdị ndụ n’oge ahụ na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ agaghị alụ nwunye, a gaghịkwa eke ha di.+ 36 N’eziokwu, ha agaghịkwa anwụ ọzọ, n’ihi na ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi. Ebe ha ga-esikwa n’ọnwụ bilie, ha ga-abụ ụmụ Chineke.
-