19 Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya,+ ma ndị mmadụ na-asị, ‘Ọ na-eri oké nri, na-aṅụkwa oké mmanya. Ọ bụ enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie.’+ Ma, ihe na-egosi na mmadụ ma ihe bụ ihe ndị dị mma ọ na-eme.”+
30 N’ihi ya, ndị Farisii na ndị òtù ha bụ́ ndị odeakwụkwọ malitere ịtamu ntamu na-asị ndị na-eso ụzọ ya: “Gịnị mere unu ji soro ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya?”+