19 Chineke wee sị: “N’eziokwu, Sera nwunye gị ga-amụrụ gị nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Aịzik.*+ Mụ na ya ga-agba ndụ. Ọ ga-abụ ọgbụgba ndụ ga-adịru ebighị ebi. Ọ ga-abụkwa ọgbụgba ndụ mụ na ụmụ* ya ga-agba.+
16 Ọ bụ Ebreham na nwa* ya ka e kwere nkwa ndị ahụ.+ Ihe e kwuru abụghị, “na ụmụ gị,”* ka à ga-asị na a na-ekwu banyere ọtụtụ ụmụ. Kama, a sịrị “na nwa gị,”* ya bụ, otu onye, bụ́ Kraịst.+