-
1 Ndị Tesalonaịka 2:14-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Ụmụnna anyị, unu na-eṅomi ọgbakọ Chineke ndị dị na Judia bụ́ ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu, n’ihi na unu tara ahụhụ n’aka ndị obodo unu+ otú hanwa na-atakwa ahụhụ n’aka ndị Juu, 15 bụ́ ndị gbudịrị Onyenwe anyị Jizọs+ na ndị amụma ma kpagbuo anyị.+ Ha anaghịkwa eme ihe dị Chineke mma, kama ha na-eme ihe na-anaghị abara onye ọ bụla uru, 16 n’ihi na ha na-agbalị ka ha gbochie anyị ịgwa ndị mba ọzọ okwu ga-eme ka a zọpụta ha.+ Ha si otú a eme mgbe niile ka mmehie ha dịkwuo ọtụtụ. Ma ọnụma Chineke emechaala bịakwasị ha.+
-