-
Matiu 6:25-30Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 “N’ihi ya, ana m asị unu: Kwụsịnụ ichegbu onwe unu+ banyere ndụ* unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ maka ihe unu ga-eyi n’ahụ́.+ Ọ̀ bụ na ndụ* adịghị mkpa karịa ihe oriri? Ahụ́ ọ́ dịghịkwa mkpa karịa uwe?+ 26 Leruonụ nnụnụ anya.+ Ha anaghị akụ mkpụrụ. Ha anaghị aghọrọ mkpụrụ, ha anaghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ a na-akwasa ihe. Ma, Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu abaghị uru karịa ha? 27 Ònye n’ime unu ga-agbakwụnyeli otu kubit* n’afọ ndụ ya maka na ọ na-echegbu onwe ya?+ 28 Gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu banyere uwe? Mụtanụ ihe n’otú okooko lili dị n’ọhịa si eto. Ha anaghị arụgbu onwe ha n’ọrụ, ha anaghịkwa akpa ogho. 29 Ma ana m asị unu na Solomọn+ eyighị uwe mara mma ka otu n’ime ha n’agbanyeghị ebube ya niile. 30 Ọ bụrụ na Chineke si otú a yiwe ahịhịa ndụ dị n’ọhịa uwe, nke dị ebe a taa, ma echi, a tụba ya n’ọkụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karịa, unu ndị okwukwe nta?
-