2 O wee sị ha: “N’uhuruchi, unu na-asị, ‘Ihu ígwé ga-adị mma, n’ihi na ọ na-acha ọbara ọbara.’ 3 N’ụtụtụ, unu na-asịkwa, ‘Mmiri ga-ezo taa, oyi ga-atụkwa, n’ihi na eluigwe na-acha ọbara ọbara ma gbaa ọchịchịrị.’ Unu ma otú e si akọwa ihu ígwé, ma unu enweghị ike ịkọwa ihe àmà nke oge a.