-
Matiu 21:28-31Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 “Gịnị ka unu chere? Otu nwoke mụtara ụmụ abụọ. Mgbe ọ gakwuuru onye nke mbụ, ọ sịrị ya, ‘Nwa m, gaa rụọ ọrụ taa n’ubi vaịn m.’ 29 Onye nke a asị, ‘Agaghị m aga,’ ma o mechara kwaa ụta gaa. 30 Ọ bịakwutere onye nke abụọ, gwa ya otu ihe ahụ. Onye nke a asị, ‘Nna m, m ga-aga,’ ma ọ gaghị. 31 Ònye n’ime ha abụọ mere uche nna ya?” Ha wee sị ya: “Onye nke mbụ.” Jizọs asị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na ndị ọnaụtụ na ndị akwụna bu unu ụzọ na-abanye n’Alaeze Chineke.
-