11 Ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ka ha ṅụọ mmanya na-egbu egbu ga-ata ahụhụ.+
Ha na-aṅụgide mmanya chi ejie, mmanya ana-egbukwa ha.
12 Mgbe ọ bụla ha na-eme oriri,
Une, ụbọ akwara, ịgbà, ọjà, na mmanya na-adị na ya.
Ma, ha anaghị echebara ihe Jehova na-eme echiche.
Ha anaghịkwa ahụ ihe o ji aka ya rụọ.