-
Matiu 27:22-26Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Paịlet wee sị ha: “Gịnịzi ka m ga-eme Jizọs, onye a sị na ọ bụ Kraịst?” Ha niile asị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+ 23 O wee sị: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha nọ na-etikwu mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”+
24 Mgbe Paịlet hụrụ na mbọ niile ọ na-agba enweghị isi, kama nke ahụ, ụzụ na-arị ibe ya elu, o ji mmiri kwọọ aka n’ihu ìgwè mmadụ ahụ ma sị ha: “Aka m adịghịkwa n’ọbara nwoke a. Ihe gbasara ya dịzi unu n’aka.” 25 Ìgwè mmadụ ahụ niile asị ya: “Ka ọbara ya dị n’isi anyị, dịkwa n’isi ụmụ anyị.”+ 26 O wee hapụrụ ha Barabas, ma nyefee Jizọs n’aka ndị agha ka ha pịa ya ụtarị,+ gbuokwa ya n’elu osisi.+
-
-
Mak 15:12-15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Paịlet gwara ha ọzọ, sị: “Gịnịzi ka m ga-eme onye unu na-akpọ Eze ndị Juu?”+ 13 Ha tiri mkpu ọzọ, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+ 14 Ma Paịlet gwara ha, sị: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tikwuru mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+ 15 Paịlet wee hapụrụ ha Barabas n’ihi na ọ chọrọ ime ihe dị ìgwè mmadụ ahụ mma. Mgbe o mechara ka a pịa Jizọs ụtarị,+ o nyefere ya n’aka ha ka e gbuo ya n’elu osisi.+
-