-
Ọpụpụ 26:31-33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 “Ị ga-eji eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi.+ A ga-akpa ndị cherob na ya. 32 Ị ga-ekonye ya n’ogidi anọ e ji osisi akeshịa rụọ bụ́ ndị e ji ọlaedo machie. A ga-eji ọlaedo rụọ ihe e ji ekonye ha. A ga-akwụnye ogidi ndị ahụ na ntọala anọ nwere oghere ndị e ji ọlaọcha rụọ. 33 Ị ga-ekonye ákwà mgbochi ahụ n’okpuru nko ndị ahụ ma bubata igbe ọgbụgba ndụ*+ ahụ n’ime ebe ahụ e ji ákwà mgbochi kochie. Ákwà mgbochi ahụ ga-ekebiri unu Ebe Nsọ+ na Ebe Kacha Nsọ.+
-