21 Malite n’oge ahụ gawa, Jizọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-aga Jeruselem nakwa na ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ata ya ezigbo ahụhụ ebe ahụ. A ga-egbukwa ya, ma, n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.+
22 Ma ọ sịrị ha: “Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, a ga-egbukwa ya.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.”+