-
Matiu 26:14-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt,+ gakwuuru ndị isi nchụàjà+ 15 wee sị ha: “Gịnị ka unu ga-enye m ka m rara ya nye n’aka unu?”+ Ha wee kwekọrịta inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.+ 16 N’ihi ya, malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-achọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji rara ya nye.
-