21 Jizọs asị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu nwere okwukwe ma ghara inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe m mere osisi fig a, kama, ọ bụrụ na unu asị ugwu a, ‘Si ebe a pụọ daba n’oké osimiri,’ ọ ga-eme.+
8 Ma unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.+ Unu ga-abụkwa ndị àmà m+ ma na Jeruselem+ ma na Judia na Sameria niile,+ ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.”*+