13 Ma, mgbe ihe inyeaka ahụ ga-abịa, bụ́ mmụọ nke eziokwu,+ ọ ga-edu unu ka unu ghọta eziokwu niile, n’ihi na ọ gaghị ekwu ihe bụ́ uche ya. Kama ihe ndị ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu, ọ ga-akọkwara unu ihe ndị ka ga-emenụ.+
27 Ma ununwa, mmụọ nsọ o ji tee unu mmanụ+ ka dị n’ime unu, ọ dịghịkwa unu mkpa ka onye ọ bụla na-akụziri unu ihe. Ma mmụọ ahụ o ji tee unu mmanụ na-akụziri unu ihe niile,+ ọ bụkwa eziokwu, ọ bụghị ụgha. Unu na ya dịrị n’otu+ otú mmụọ ahụ kụziiri unu.