15 Ha wee bịarute Jeruselem. N’ebe ahụ, ọ banyere n’ụlọ nsọ ma malite ịchụpụ ndị na-ere ihe na ndị na-azụ ihe n’ụlọ nsọ. O kpuru tebụl ndị na-agbanwe ego nakwa oche ndị na-ere nduru ihu n’ala.+ 16 O kweghịkwa ka onye ọ bụla buru ihe ọ bụla si n’ụlọ nsọ gafere.