Matiu 12:38 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 38 Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii wee sị ya: “Onye Ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe àmà.”+ Matiu 16:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 Ndị Farisii na ndị Sadusii wee bịakwute ya ka ha nwaa ya. Ha gwara ya ka o gosi ha ihe àmà si n’eluigwe.+ Jọn 4:48 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 48 Ma Jizọs sịrị ya: “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube* na ihe ịtụnanya, unu emekataghị kweta.”+ Jọn 6:30 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 30 Ha sịziri ya: “Olee ọrụ ebube ị ga-arụ,*+ ka anyị hụ ya ma kwere na gị? Olee ọrụ ị ga-arụ?
16 Ndị Farisii na ndị Sadusii wee bịakwute ya ka ha nwaa ya. Ha gwara ya ka o gosi ha ihe àmà si n’eluigwe.+