10 “M ga-awụsa ụlọ Devid na ndị bi na Jeruselem mmụọ amara na nke arịrịọ. Ha ga-elegide onye ha mara ube anya,+ ha ga-ebekwara ya ákwá arịrị otú a na-ebe ma nwa nwoke a mụrụ naanị ya nwụọ. Ha ga-eruru ya uju otú a na-eru ma ọkpara nwụọ.
7 Ọ ga-abịa n’ígwé ojii.+ Anya niile ga-ahụ ya. Ndị mara ya ube ga-ahụkwa ya. Ebo niile nke ụwa ga-eti aka n’obi, ruokwa uju n’ihi ya.+ N’eziokwu, ihe a ga-emerịrị. Amen.