-
Diuterọnọmi 21:22, 23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 “Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie ga-eme ka a ma ya ikpe ọnwụ, e wee gbuo ya,+ kwụwa ya n’osisi,+ 23 ozu ya agaghị adị n’elu osisi abalị niile.+ Kama, unu ga-ahụ na e liri ya n’ụbọchị ahụ, n’ihi na onye a kwụwara n’osisi bụ onye Chineke bụrụ ọnụ.+ Unu emerụla ala unu nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu.+
-
-
Matiu 27:57-60Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
57 Ma mgbe o ruru mgbede, otu nwoke bara ọgaranya bịara. Ọ bụ onye Arimatia. Aha ya bụ Josef, ọ bụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs.+ 58 Nwoke a gakwuuru Paịlet rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs.+ Paịlet wee gwa ndị agha ahụ ka ha bunye ya ozu ahụ.+ 59 Josef buuru ozu ahụ, fụchie ya ezigbo ákwà linin dị ọcha,+ 60 liekwa ya n’ili* ọhụrụ+ o gwuru n’oké nkume. Ọ kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ụzọ ili* ahụ lawa.
-
-
Mak 15:43-46Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
43 Josef onye Arimatia bịara. O so ná ndị a na-akwanyere ùgwù n’ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu.* Ọ nọkwa na-eche ka Alaeze Chineke bịa. Ọ katara obi gakwuru Paịlet ma rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs.+ 44 Ma Paịlet chọrọ ịma ma Jizọs ọ̀ nwụọla, ya akpọọ onyeisi ndị agha ahụ, jụọ ya ma ọ̀ nwụọla. 45 Mgbe ọ chọpụtara n’aka onyeisi ndị agha ahụ na Jizọs anwụọla, o nyere Josef ikike ka o buru ozu ya. 46 Mgbe Josef zụtachara ezigbo ákwà linin ma budata ozu Jizọs, o ji ezigbo ákwà linin ahụ fụchie ya ma lie ya n’ili*+ e gwuru n’oké nkume. O wee kwara otu nkume kwachie ọnụ ili ahụ.+
-