3 Ka ọ nọ na-aga Damaskọs, ya afọkwa obere ka o ruo, ìhè si n’eluigwe nwuo gburugburu ya na mberede,+4 ya adaa n’ala ma nụ olu na-agwa ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?”
9Ọ̀ bụ na mụ enweghị ike ime ihe m chọrọ ime? Ọ̀ bụ na mụ abụghị onyeozi? Ọ̀ bụ na mụ ahụghị Jizọs Onyenwe anyị?+ Ọ̀ bụ na unu abụghị ihe m rụpụtara n’ọrụ Onyenwe anyị?