3 “Abụ m onye Juu+ a mụrụ na Tasọs nke dị na Silishia.+ Ma, agụrụ m akwụkwọ n’obodo a. Ọ bụkwa Gameliel+ kụziiri m ihe. A kụziiri m ka m na-esosi Iwu nna nna anyị hà soro ike.+ M na-anụkwa ọkụ n’obi n’ozi m na-ejere Chineke otú unu niile na-eme taa.+