-
Ọrụ Ndịozi 22:6-8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 “Ma mgbe ọ fọrọ obere ka m ruo Damaskọs, n’ihe dị ka n’etiti ehihie, m hụrụ ìhè dị egwu si n’eluigwe nwuo gburugburu m na mberede.+ 7 M wee daa n’ala ma nụ olu sịrị m: ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’ 8 Mụ asị ya: ‘Ị̀ bụkwanụ onye?’* Ya asị m: ‘Abụ m Jizọs onye Nazaret, onye ị na-akpagbu.’
-