16 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+
4 Ma, n’ihi ebere Chineke na-enweghị atụ+ na otú o si hụ anyị n’anya hie nne,+5 o mere ka anyị dịrị ndụ, anyị na Kraịst adịrịkwa n’otu, n’agbanyeghị na anyị dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ihi mmehie anyị.+ N’eziokwu, ọ zọpụtala unu n’ihi amara ya.
18 Kraịst, bụ́ onye ezi omume, nwụrụ naanị otu ugboro n’ihi ndị mmehie+ ka o duga unu ebe Chineke nọ.+ Ọ bụ mmadụ mgbe ọ nwụrụ,+ ma ọ bụ mmụọ mgbe e mere ka ọ dị ndụ.+
10 Otú a ka ịhụnanya a dị: Ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà maka mmehie anyị+ nke ga-eme ka anyị na ya dị n’udo.+