-
Ndị Galeshia 4:4-6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ́ onye nwaanyị mụrụ,+ onye nọkwa n’okpuru iwu,+ 5 ka o wee zụrụ ndị nọ n’okpuru iwu ma tọhapụ ha,+ ka e wee mee ka anyị bụrụ ụmụ Chineke.+
6 Ebe ọ bụ na unu bụ ụmụ, Chineke etinyela mmụọ+ nke Ọkpara ya n’obi anyị.+ Mmụọ ahụ na-etikwa mkpu, sị: “Aba,* Nna!”+
-