38 “N’ihi ya, ụmụnna m, ya doo unu anya na ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke na-esi n’aka ya agbaghara anyị mmehie. Ọ bụ ihe a ka a na-ekwusara unu.+39 Marakwanụ na Iwu Mosis emelighị ka unu bụrụ ndị ezi omume.+ Ma n’ihi ọnwụ nwoke a, Chineke ga-agụ onye ọ bụla kweere na ya n’onye ezi omume.+
16 “‘Ihe a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ahụ gachara,’ ka Jehova* kwuru. ‘M ga-etinye iwu m n’uche ha, m ga-edekwa ya n’obi ha,’”+17 o kwuziri, sị: “Agaghịzi m echeta mmehie ha na omume ọjọọ ha.”+