-
Abụ Ọma 14:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Ndị nzuzu* na-asị n’obi ha:
“Jehova adịghị.”+
Ha na-eme omume rụrụ arụ, na-emekwa ihe ọjọọ dị iche iche.
E nweghị onye na-eme ihe dị mma.+
2 Ma Jehova si n’eluigwe na-ele ndị mmadụ anya
Ka ọ hụ ma è nwere onye na-aghọta ihe, ma è nwere onye na-achọ Jehova.+
3 Ha niile akwụsịla ime ihe dị mma.+
Ha niile rụrụ arụ.
E nweghị onye na-eme ihe dị mma,
E nweghịdị otu onye.
-