6 Ma onye ọ bụla nke mere ka otu n’ime ndị a dị nta bụ́ ndị nwere okwukwe na m mehie, ọ ga-akara ya mma na e weere nkume e ji egwe nri nke jakị na-akwagharị konye ya n’olu ma tụba ya n’oké osimiri.+
15 N’ihi na ọ bụrụ na nri ị na-eri na-akpasu nwanna gị iwe, ị naghịzi egosi na ị hụrụ ya n’anya.+ Ekwela ka nri ị na-eri bibie* nwanna gị, onye Kraịst nwụrụ maka ya.+