7 “Ọ bụrụ na otu n’ime ụmụnne unu adaa ogbenye n’otu n’ime obodo unu, n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu akpọchila obi unu ma ọ bụ jụ inyere nwanne unu dara ogbenye aka.+
10 Unu kwesịrị imesapụrụ ya aka,+ ya ewutekwala unu* na unu na-enye ya ihe, n’ihi na ọ bụ ya mere Jehova bụ́ Chineke unu ga-eji gọzie ihe ọ bụla unu na-eme na ihe ọ bụla unu na-arụ.+