-
Ndị Rom 16:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Ụmụnna m, m na-agba unu ume ka unu kpachara anya maka ndị na-akpata nkewa ma na-eme ihe ndị nwere ike ime ka unu zọhie ụkwụ. Ihe ndị a ha na-eme dị iche n’ihe a kụziiri unu. Zerekwanụ ndị ahụ.+ 18 N’ihi na ụdị ndị ahụ anaghị agbara Onyenwe anyị Kraịst ohu, kama ọ bụ ihe na-agụ ahụ́ ha agụụ* ka ha na-agbara ohu. Ha na-ekwukwa okwu na-atọ ụtọ ma na-aja ndị mmadụ mma na-esighị ha n’obi ka ha rafuo ndị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi.
-