6 Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ya.+ 7 Ọ ga-enye ndị tachiri obi na-arụ ọrụ dị mma ndụ ebighị ebi, ya bụ, ndị na-achọ ebube na nsọpụrụ na ahụ́ na-agaghị ere ure.+ 8 Ma ọnụma ya na iwe ya ga-abịara ndị na-ese okwu na ndị na-enupụrụ eziokwu isi ma na-erubere ajọ omume isi.+