10 Ụmụnna m, m ji aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-agba unu ume ka unu niile na-ekwu otu ihe, ka unu gharakwa ịna-akpa iche iche,+ kama ka unu nwee otu obi, ka ihe unu na-eche bụrụkwa otu.+
15 Kwenụ ka udo nke Kraịst na-achị obi unu,+ n’ihi na Chineke kpọrọ unu ka unu bụrụ otu ahụ́, nọrọkwa n’udo. Gosikwanụ na obi dị unu ụtọ maka ihe e meere unu.