10 Ụmụnna m, m ji aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-agba unu ume ka unu niile na-ekwu otu ihe, ka unu gharakwa ịna-akpa iche iche,+ kama ka unu nwee otu obi, ka ihe unu na-eche bụrụkwa otu.+
11 N’ikpeazụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-emezikwanụ ebe ndị unu na-anaghị emetecha.* Na-ekwenụ ka a kasie unu obi.+ Nweenụ otu obi,+ na-ebikwanụ n’udo.+ Chineke nke udo,+ onye hụrụ anyị n’anya, ga-anọnyere unu.
8 N’ikpeazụ, unu niile nwee otu obi.+ Ka ihe banyere ibe unu na-emetụ unu n’obi. Hụnụ ibe unu n’anya ka ụmụnne. Na-enwenụ obi ebere,+ dịrịkwanụ umeala n’obi.+