6 Ma ugbu a, e nyela Jizọs ozi ka nnọọ mma* n’ihi na ọ bụkwa onye ogbugbo+ nke ọgbụgba ndụ ka mma.+ Iwu Chineke kwadoro ọgbụgba ndụ a, o hiwekwara isi ná nkwa ndị ka mma.+
15 Ọ bụ ya mere o ji bụrụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ ka e wee kwe ndị a kpọrọ nkwa na ha ga-enweta ngọzi* na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ihe niile a nwere isi n’ihi ọnwụ ya nke e si na ya gbapụta ha+ ma tọhapụ ha ná mmehie ndị ha na-eme n’ọgbụgba ndụ mbụ ahụ.