-
2 Ndị Tesalonaịka 2:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ụmụnna anyị, banyere ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst+ nakwa mkpọkọta a ga-akpọkọta anyị n’ebe ọ nọ,+ anyị na-arịọ unu 2 ka unu ghara ikwe ka e jiri okwu yiri ka ò si n’aka Chineke*+ ma ọ bụ ozi e ji ọnụ zie ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ozi yiri ka ò si n’aka anyị megharịa unu anya ma ọ bụ mee ka unu chewe na ụbọchị Jehova*+ abịala.
-