28 Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya+29 wee pụta. Ndị mere ezi ihe ga-esi n’ọnwụ bilie ka ha dị ndụ,* ma ndị mere ihe ọjọọ ga-esi n’ọnwụ bilie ka e kpee ha ikpe.*+
42 Ọ gwakwara anyị ka anyị kwusaara ndị mmadụ ozi ọma ma gbaa àmà nke ọma+ na onye a bụ onye Chineke kpebiri na ọ ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.+