-
1 Samuel 2:27, 28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Otu onye amụma Chineke bịakwutere Ịlaị, sị ya: “Jehova kwuru, sị: ‘Ọ̀ bụ na mụ emeghị ka nna nna gị na ezinụlọ ya mara onye m bụ mgbe ha ka nọ n’Ijipt na-agbara Fero ohu?*+ 28 Ọ bụkwa ya ka m họọrọ n’ebo Izrel niile+ ka ọ bụrụ onye nchụàjà nakwa ka ọ na-aga n’elu ebe ịchụàjà m+ na-achụ àjà, na-amụnye insens* ọkụ, yirikwa efọd na-ejere m ozi. Ọ bụ ya mere m ji nye ya na ụmụ ya ikike iwere ụfọdụ anụ n’anụ ndị Izrel ga-eji chụọrọ m àjà.+
-