15 N’ụbọchị nke asaa, ha biliri n’isi ụtụtụ ozugbo chi bọrọ, gaa obodo ahụ gburugburu otú ha na-eme. Ha gara nke ugbu a ugboro asaa. Naanị n’ụbọchị ahụ ka ha gara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa.+
20 Mgbe a fụrụ opi, ndị agha tiri mkpu.+ Ozugbo ha nụrụ ụda opi ahụ ma tie ezigbo mkpu agha, mgbidi obodo ahụ dara, daruo ala.+ Onye ọ bụla n’ime ha esi ebe o chere ihu banye n’obodo ahụ. Ha wee weghara obodo ahụ.