31 Chineke buliri onye a elu ka ọ nọrọ n’aka nri ya.+ Ọ họpụtara ya ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Ndú+ na Onye Nzọpụta.+ Chineke mere ihe a ka ndị Izrel chegharịa, ka a gbagharakwa ha mmehie ha.+
10 Onye ahụ ihe niile dị n’ihi ya, onye ihe niile sikwa n’aka ya dịrị, nọ na-eme ka ọtụtụ ụmụ ya dị ebube.+ N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na o mere ka Nnukwu Onye Ndú e si n’aka ya zọpụta ha+ taa ahụhụ, ka ahụhụ ọ tara wee mee ka o zuo okè.+