-
Ọpụpụ 19:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Ị ga-akpara ndị Izrel ókè gburugburu ugwu a ma sị ha, “Lezienụ anya ka unu ghara ịgbago n’ugwu a, ka ahụ́ unu gharakwa imetụ n’akụkụ ya. Onye ọ bụla ahụ́ ya metụrụ n’ugwu a, a ga-egburịrị ya. 13 E nweghị onye ga-emetụ onye ahụ aka, kama a ga-atụ ya nkume ma ọ bụ jiri akụ́ gbagbuo ya.* Ọ gaghị adị ndụ, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ.’+ Ma ha nwere ike ịgbagote n’ugwu a mgbe a fụrụ opi.”*+
-