12 Akọnuche anyị dị ọcha n’ihi na, mgbe anyị na ndị ụwa nọ, nakwa karịchaa, mgbe anyị na unu nọ, anyị kpara àgwà dị nsọ, nweekwa obi dị ọcha nke si n’aka Chineke. Ma, ọ bụghị amamihe ụwa mere anyị ji ebi ndụ otú a,+ kama ọ bụ amara Chineke meere anyị. Ọ bụ ihe ndị a ka anyị ji anya isi.