Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 15:7, 8
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 7 “Ọ bụrụ na otu n’ime ụmụnne unu adaa ogbenye n’otu n’ime obodo unu, n’ala Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu akpọchila obi unu ma ọ bụ jụ inyere nwanne unu dara ogbenye aka.+ 8 Unu ga-emesapụrụ ya aka+ ma gbazinye ya ihe ọ bụla na-akpa ya.

  • Matiu 25:35, 36
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 35 N’ihi na agụụ gụrụ m, unu enye m nri ka m rie. Mmiri gụrụ m, unu ekunye m mmiri ka m ṅụọ. Abụ m ọbịa, unu anabata m nke ọma.+ 36 Agba m ọtọ, unu eyiwe m uwe.+ Arịara m ọrịa, unu elekọta m. Anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu abịa leta m.’+

  • Luk 3:11
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 11 Ya asị ha: “Onye nwere uwe abụọ, ya chịrị otu chịnye onye na-enweghị. Onye nwere ihe ọ na-eri, ya meekwa otu ihe ahụ.”+

  • Ndị Rom 12:13
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 13 Na-enyenụ ndị nsọ ihe na-akpa ha.+ Na-elenụ ọbịa.+

  • 1 Timoti 5:4
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 4 Ma ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla di ya nwụrụ mụrụ ụmụ ma ọ bụ na o nwere ụmụ ụmụ, ha buru ụzọ lekọta ndị ezinụlọ ha+ iji gosi na ha na-efe Chineke. Ha kwesịrị ịna-emere ndị nne na nna ha na ndị nne nne ha na ndị nna nna ha ihe ha kwesịrị imere ha.+ Ọ na-amasị Chineke ma ha na-eme otú a.+

  • Jems 1:27
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 27 Ofufe* dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna+ na ụmụ nwaanyị isi mkpe+ na-ata ahụhụ aka,+ nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.+

  • 1 Jọn 3:17
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 17 Ma onye ọ bụla nke nwere akụ̀ nke ụwa a ma ya ahụ na e nwere ihe na-akpa nwanna ya, ma o kweghị emetere ya ebere,* olee otú ọ ga-esi ekwu na ya hụrụ Chineke n’anya?+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya